browsetext-to-speech

Want to know what "nwaanyi" means in Igbo? View the translations below.

nwáànyị̀

Translates to
woman 

noun

an adult female person (as opposed to a man)
"the woman kept house while the man hunted"
Sentences

Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.

But I say unto you, That every one that looketh on a woman to lust after her hath committed adultery with her already in his heart.

Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

But listen to the law I give. Every man who separates himself from his installation, which he has not kept in the place of fornication, has committed sin, because he puts the woman in a state of fornication. If the woman marries again, the man who marries her commits adultery.

Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nꞌọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nꞌazụ bịaruo Jisọs nso, metụ ọnụ uwe ya aka.

But he had a weak woman. She has been living with the disease for 12 years. He also suffered from persistent hemorrhage. This woman from behind approached Jesus and touched the hem of his garment.

Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, atụla egwu, nꞌihi na e sitela nꞌokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nꞌoge ahụ.

Jesus turned to her and said, "Daughter, do not be afraid; for by your faith you are healed." And the woman was healed from that hour.

Jisọs gwara ha okwu sị ha, “Pụọnụ nꞌezi, nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.” Mgbe Jisọs kwuru okwu a, ndị nọ nꞌebe ahụ chịrị ya ọchị.

Jesus said to them, "Come on, this woman is not dead but sleeping." When Jesus said this, the people who were there laughed at him.

Ọzọ kwa, Jisọs ji alaeze eluigwe tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo.

Also, Jesus likened the kingdom of heaven to a leaven of leaven, which a woman took and mixed with flour until the leaven leavened.

Nꞌebe ahụ, otu nwanyị onye Kena bi nꞌobodo ahụ bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devidi, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nꞌime ya nke na-esogbu ya oge nile.”

There a woman from the city of Canaan came to Jesus and asked him, saying, “Have mercy on me, Lord, Son of David. The daughter of an evil spirit in him constantly harasses her. ”

Ma Jisọs egheghị nwanyị ahụ ọnụ. Ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya rịọọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si esogharị anyị na-enye anyị nsogbu site nꞌarịrịọ ya!”

But Jesus did not kiss her. He was silent. After that the disciples came up to Jesus and asked him, “chase after this woman! How sorry he is to intercede with us in pleading for him! ”

Jisọs sịrị nwanyị ahụ, “Ezitere m nanị inyere ndị Juu aka, ndị bụ atụrụ furu efu nke Izirel.”

Jesus said to the woman, "I am sent only to help the Jews, who are lost sheep of Israel."

Ma nwanyị a bịara daa nꞌụkwụ Jisọs rịọọ ya arịrịọ sị ya, “Onyenwe m, nyere m aka!”

But this woman, falling down at Jesus' feet, pleaded with him, "Lord, help me!"

Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meerala gị ihe ị na-arịọ.” Nꞌotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

Jesus answered her, “Woman, great is your faith! Then your request was granted. ”At the same time her daughter was healed.

Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.

Jesus answered them, “Do you not read the Scriptures? In it it is written, 'The first man and woman created them,'

Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

But I say unto you, That whosoever shall put away his marriage to another, to commit adultery, shall not be taken away from him, for he hath committed a sin of adultery. Everyone that marries a woman divorced from her husband commits adultery. ”

Ma ọ dị otu ezinụlọ ebe e nwere ụmụnne nwoke asaa. Nwoke nke mbụ lụrụ nwụnye, ma ọ nwụrụ na-amụtaghị nwa. Nꞌihi nke a nwanyị ahụ ghọrọ nwụnye nwanne ha nwoke nke abụọ.

But there was one family with seven brothers. The first man married, but died childless. Because of this the woman became the second son of their brother.

Otu a ka o dị, tutuu ruo mgbe nwanyị ahụ mesịrị bụrụ nwụnye ụmụnne nwoke asaa ahụ.

This was the case, until the woman eventually became the installation of the seven brothers.

Ugbu a, ajụjụ anyị bụ nke a, nꞌoge ahụ dị nꞌihu, mgbe a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilite dịrị ndụ ọzọ, nwụnye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a buzuru di ya mgbe ọ nọ nꞌụwa?”

Our question now is, in the time ahead, when the dead will be raised to life again, who will be the woman, since all seven brothers are the husband? When he got it? ”

Related Words
Near-By Words
-né ányálook, look forward, expect
nwáyọ̀gently, easy
-nwéhave