browsetext-to-speech

Want to know what "oge" means in Igbo? View the translations below.

ógè

Translates to
time 

noun

the continuum of experience in which events pass from the future through the present to the past
"he waited for along time"
"it took some time before he got an answer"
"time flies like an arrow"
Sentences

Nwokorọbia ahụ bụ Mak, nyere anyị akụkọ nke ya, dị ka o si nụ ya site nꞌọnụ Pita. O mere ka anyị hụ Jisọs dị ka onye ji oge nile o nwere na-arụ ọrụ ịgba ndị mmadụ ume, na nke igosi ha ihunanya ya.

The young man Mark gave us his own account, as he heard from Peter. It portrays Jesus as a full-time minister of love and affection.

Ya mere, site nꞌEberaham ruo na Devidi e nwere ụgbọ iri na anọ. Ma site nꞌoge Devidi ruo mgbe e mere ka ha gaa biri nꞌala Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nꞌoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Jisọs bụkwa ọgbọ iri na anọ.

So, from Abraham to David there were fourteen ships. And from the time of David until the exile in Babylon, there are fourteen generations. And from that time until Jesus was born was also fourteen generations.

A mụrụ Jisọs na Betilehem nke Judia nꞌoge Herọd bụ eze. Mgbe ahụ, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịara na-ajụ ajụjụ sị,

Jesus was born in Bethlehem of Judea in the time of Herod. Then the wise men from the east came in and asked,

Nꞌoge mgbe ahụ, Jọn omee baptizim bidoro ikwusa okwu Chineke nꞌọzara Judia. Isi okwu ya bụ,

About this time John the Baptist began preaching the word of God in the wilderness of Judea. His theme is,

Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, sitenụ na mmehie unu bịakwute Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe na-abịa nso.”

From that time onward Jesus began preaching and said, "Repent ye, and turn to God, for your kingdom is at hand."

Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.

Only those who do not know God spend time thinking about these things. It is also up to them that these things go too far. Instead, trust in God, for He knows all your needs.

Nꞌoge ahụ, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịakwutere ya sị ya, “Onye ozizi, aga m eso gị gaa ebe ọ bụla ị na-aga.”

At that time a chief of the Jews came to him and said, "Teacher, I will go with you wherever you go."

Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha tiri mkpu bido na-ajụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupuu i bido ịta anyị ahụhụ?”

When they saw Jesus, they began to ask Jesus, saying: “What have we to do with you and with you, God's Son? Won't you think it's time to start punishing us? ”

Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “O kwesịrị ka ndị enyi onye na-alụ nwụnye ọhụrụ nọọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.

Jesus asked them, “Should the friends of the bridegroom mourn and not eat the bread, while they are with the husband? There comes a time when I will be taken away from them, and then they will fast.

“Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu. A ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nꞌoge ahụ.

“When they arrest you, do not worry about what to say. You will have a right to know what to say during that time.

“Unu atụla egwu ndị na-emenye unu ụjọ. Oge na-abịa mgbe a ga-ekpughe eziokwu nile. A ga-emekwa ka izuzu obi nile zoro ezo pụta ìhè.

“Do not be afraid of those who fear you. There will come a time when all truth will be revealed. The secret of all the hidden heart will be made manifest.

Jọn omee baptizim nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube nile Jisọs na-arụ, o ziri ndị na-eso ụzọ ya ozi ka ha gaa jụọ Jisọs ajụjụ sị,

John the Baptist was in prison at that time. When he heard about the miracles Jesus was doing, he dispatched his disciples to question Jesus, saying:

Site nꞌoge Jọn omee baptizim malitere izisa ozi ọma ruo ugbu a, ndị ụwa ji ike na-egbochi ọganihu alaeze eluigwe. Ma ọ bụkwa nanị ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na-eji ike abanye nꞌime ya.

From the time of John the Baptist began preaching until now, the world has been powerfully hindering the progress of the kingdom of heaven. But it is also the only people with whom he or she has a strong desire to enter it.

Nꞌoge ahụ, Jisọs kpere ekpere sị, “Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gị, nꞌihi na i zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.

During that time, Jesus prayed, "Father, Lord of heaven and earth, I thank thee, that thou hast hid the truth from the experts, and have made it known unto the children.

Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ tokọtaa, tutuu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nꞌoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunụ ụzọ fopụtasịa ahịhịa ndị a nile, kee ha nꞌukwu nꞌukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpọkọtaanụ ọka ndị a tinye ha nꞌọba.’ ”

Leave the corn to germinate with the grass, cool until harvest. At that time I would command the harvesters, first to chop out all these herbs and to cut them into stews and burn them. And gather the grain and put them into the stocks. '”

Oge nile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọ bụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.

Jesus often spoke to these people in a parable. At no time did he give them leave without using a parable.

Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.

The enemy that went to sow the weeds was the devil. Harvest represented the end of time. Harvesters are angels too.

Ọ bụ nꞌoge a ka Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs.

It was about this time that Herod the king of Galilee heard of Jesus.

Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meerala gị ihe ị na-arịọ.” Nꞌotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

Jesus answered her, “Woman, great is your faith! Then your request was granted. ”At the same time her daughter was healed.

Nꞌụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie na oji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nꞌihe ịrịba ama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nꞌime ya pụtara.

Many say, 'Today we will have rain because the sky is red and black.' See that you can interpret the sky, but you cannot see by these signs; Explain the meaning of the times in which we are living.

Related Words
ílóenmity
ótúmanner, way
íkéability, strength, power
òtùgroup
ónyéperson
íféthing
Near-By Words