browsetext-to-speech

Want to know what "nwoke" means in Igbo? View the translations below.

nwókē

Translates to
man 

noun

an adult person who is male (as opposed to a woman)
"there were two women and six men on the bus"
Sentences

Matiu, ọna ụtụ, bụ nwoke ahụ hapụrụ ọrụ ịna ụtụ ya soro Jisọs. Nꞌakwụkwọ nke ya o gosiri anyị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ụwa, onye ndị amụma Chineke gbara ama na ọ ga-abịa ọtụtụ afọ gara aga.

Matthew, a tax collector, was the man who left his tax duties to follow Jesus. In his book he shows us that Jesus is the Savior of the world, whom God's prophets warned would come many years ago.

Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya.

Concerning the birth of Jesus the Savior, God caused His mother Mary to become pregnant by the Holy Spirit, when a man called Joseph was about to marry her.

Ma nwoke a na-achọ ịlụ Meri bụ ezi mmadụ. Nꞌihi ya, mgbe ọ chọpụtara na Meri dị ime, o zubere ịhapụ ya na nzuzo, nꞌihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ihe bụ ọnọdụ Meri.

But the man who wanted to marry Mary was good. So, when he found out that Mary was pregnant, he intended to keep her secret, because he did not want people to know about Mary's condition.

“Nꞌime iwu Mosisi e kwuru na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla achọọ ikewapụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, ọ ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ nkewa ma ọ bụ akwụkwọ achọghị m nye ya.

“Under the Mosaic law, if a man wishes to separate himself from his installation, he must first write a separation or an objection to him.

Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

But listen to the law I give. Every man who separates himself from his installation, which he has not kept in the place of fornication, has committed sin, because he puts the woman in a state of fornication. If the woman marries again, the man who marries her commits adultery.

“Onye ọ bụla ṅara ntị nꞌokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nꞌelu nkume sịrị ike.

“Everyone who obeys these words of mine, and does them, is like a wise man who built his house upon the rock-mass.

“Ma ndị nile nụrụ okwu ndị a, ma lefuo ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu aja.

“But as many as hear these things, and disregard them, are foolish. They are like the man who built his house upon the sand.

Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Jekwuru onyeisi nchụaja, akọkwarala onye ọ bụla nꞌụzọ. Were onyinye gị mgbe ị na-aga dị ka e dere ya nꞌiwu Mosisi. Gaa ka onyeisi nchụaja lee gị ahụ, kwuokwara ọha na ị dịla ọcha.”

Jesus commanded the man, “Go to the chief priest, and tell no one on the way. Take your gifts along the way as stated in the Mosaic Law. Go see the chief priest, and tell the people that you are clean. ”

O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ, onye ifufe na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”

The disciples were amazed and asked, "What sort of man is this, who is doing the things that he commanded?"

Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”

Some men soon brought him a man with a withered limb. When Jesus saw the faith in those who had brought him this man, he said to the sick man, "Take heart because I have forgiven your sins."

Ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulukwanụ Chineke.”

Some Jewish religious teachers there said to themselves, "This man blasphemes God."

Olee nke karịrị ịdị mfe ikwu? Ọ bụ ịsị na a gbagharala nwoke a mmehie ya, ka ọ bụ ịsị ya bilie gaa ije?

Which is easier said than done? To say that this man has been forgiven of his sins, or to say that he got up and walked?

Ma ime ka unu mata na m nwere ike ịgbaghara mmadụ mmehie ya nꞌụwa a, ana m asị gị, nwoke, bilie, chịrị ute gị laa!”

But to show you that I can forgive this sin of the world, I say to you, man, arise, and take your bed! ”

Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ pụọ ịga nꞌihu nꞌije ya, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọ nꞌụlọ ebe ọ nọ na-arụ ọrụ ịnakọta ụtụ. Jisọs kpọrọ ya sị ya, “Soro m bịa bụrụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ m.” Na-atụfughị oge Matiu hapụrụ ihe nile soro ya.

As Jesus left the place to go for his trip, he found a man named Matthew sitting in the house where he was working. Jesus invited him, saying, “Come with me to one of my disciples.” Not to miss the moment that Matthew left everything behind.

Nꞌihi nke a, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya biliri soro nwoke ahụ malite ịga nꞌụlọ ya.

Because of this, Jesus and his disciples got up and began to walk with the man.

Mgbe ndị a sitere nꞌebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere Jisọs nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nꞌime ya.

When these people left, the others brought Jesus a dumb man, who was possessed by a demon.

Saịmọn onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom, na Judas Iskariọt, nwoke raara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya.

Simon the Jewish leader wanted to overthrow the Roman government, and Judas Iscariot, the man who betrayed Jesus.

“Nꞌezie, ọ dịghị nwoke ọ bụla nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe dị ukwuu karịa Jọn.

“In fact, no man is born greater than John the Baptist. But the smallest person in the kingdom of heaven is greater than John.

Nꞌebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nꞌebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “O ziri ezi nꞌiwu ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike?”

Here he saw a man with a withered hand. Those around him asked him, "Is it right to heal on the Sabbath?"

Ọ kpọrọ nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Setipụ aka gị!” Nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.

He called out to the man with the paralyzed hand and said, “Stretch out your hand!” The man reached out his hand. The hand was as good as the other hand.

Related Words
Near-By Words