browsetext-to-speech

Want to know what "tinye" means in Igbo? View the translations below.

-tínyé

Translates to
put 

verb

put into a certain place or abstract location
"Put your things here"
"Set the tray down"
"Set the dogs on the scent of the missing children"
"Place emphasis on a certain point"
Sentences

Mee ọsịịsọ ka gi na onye iro gị kpezie mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nꞌaka okpe ikpe onye ga-enyefe gị nꞌaka ndị ga-etinye gị nꞌụlọ mkpọrọ.

Be quick to settle the matter with your opponent before he or she has taken your case to the Judicial Ombudsman.

Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

But listen to the law I give. Every man who separates himself from his installation, which he has not kept in the place of fornication, has committed sin, because he puts the woman in a state of fornication. If the woman marries again, the man who marries her commits adultery.

Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ochie nꞌihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-eche ha abụọ nke ọma.”

And no one puts new wine into old wineskins, because the new wine will burst the wineskins. But it is better to put new wine in new bottles, than both. ”

“Onye a bụ ohu m, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nꞌanya. Ọ bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye mmụọ m nꞌime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba nile aka.

“This is my servant, whom I have chosen. Whom I love. He is also my find. I'll put my spirit in it. Justice will reach all the nations.

ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alọghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ na-alọghachikwa jekwuru nwoke ahụ. Mgbe o ruru nꞌebe nwoke ahụ nọ, ọ ga-ahụ na e meela ka obi nwoke ahụ dị ọcha, ma ọ tọgbọrọ nꞌefu, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ e tinyere nꞌime ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụọ na mbụ.

he said to himself, 'I will return to the man I came from.' The demon returns to the man. When he arrives at the man, he will find that the man's heart has been cleansed, but he is lost, for nothing else has been put in him, when the demon has gone out of him.

Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ tokọtaa, tutuu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nꞌoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunụ ụzọ fopụtasịa ahịhịa ndị a nile, kee ha nꞌukwu nꞌukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpọkọtaanụ ọka ndị a tinye ha nꞌọba.’ ”

Leave the corn to germinate with the grass, cool until harvest. At that time I would command the harvesters, first to chop out all these herbs and to cut them into stews and burn them. And gather the grain and put them into the stocks. '”

Nꞌihi na, na mbụ, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, maka ime ka obi tọọ nwụnye ya Herodias ụtọ. Herodias bụ rịị nwụnye Filip nwanne Herọd. Ma Herọd mere ka Herodias site nꞌaka Filip gbapụta bịa bụrụ nwụnye nke ya.

Because, at first, Herod arrested John and bound him and put him in prison, to please his Herodias. Herodias was the son of Herod the brother of Herod. But Herod had Herodias brought out of Philip by his own body.

“Ugbu a geekwanụ ntị nꞌilu ọzọ. Otu nwoke dị nke nwere ala ubi. Nwoke a kụrụ osisi oroma nꞌubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, wuokwa mbadamba ebe a ga-anọ mee mmanya nꞌime ya. O wukwara ụlọ nche nꞌime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nꞌaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa biri nꞌala ọzọ.

“Now listen to another parable. There was a man who owned a plot of land. The man planted an orange tree in the garden. He also built his own garden and set up a wine cellar. And he built towers in it. After doing these things, he placed the garden in the care of the gardeners, and went away to live in another country.

Ndị nọ nꞌebe ahụ zara sị ya, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nꞌiyi nꞌụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nꞌoge ya.”

“Those who are evil, he will kill them,” they answered. He will put his field in the care of the other men, who will give him the fruit in his season. "

Related Words
Near-By Words