browsetext-to-speech

Want to know what "otutu" means in Igbo? View the translations below.

ọ̀tụ́tụ́

Translates to
many 

determiner

Sentences

Matiu, ọna ụtụ, bụ nwoke ahụ hapụrụ ọrụ ịna ụtụ ya soro Jisọs. Nꞌakwụkwọ nke ya o gosiri anyị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ụwa, onye ndị amụma Chineke gbara ama na ọ ga-abịa ọtụtụ afọ gara aga.

Matthew, a tax collector, was the man who left his tax duties to follow Jesus. In his book he shows us that Jesus is the Savior of the world, whom God's prophets warned would come many years ago.

Nꞌoge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ, ndị sitere Jerusalem na ndị si nꞌakụkụ Jọdan, na obodo ndị ọzọ na Judia, bịara ige ya ntị.

Meanwhile, many people from Jerusalem and from the other side of the Jordan and from the other towns of Judea came to listen to him.

“Ala Zebulọn na Naftalị, nke dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na Galili, ebe ọtụtụ ndị mba ọzọ bi. Nꞌebe ahụ,

Zebulun and Naphtali, on the other side of the Jordan and Galilee, where many foreigners live. There,

Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile.

News of these disasters spread throughout Syria. Then many people brought to him all those who were sick, suffering from all kinds of illnesses, those who were sick, demonized, and those who had paralysis, and those with paralysis. And he healed them all.

“Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu.

“When praying, do not say the same things as the rest do. They thought that God would hear their prayers because of their many words. Remember that before you make any request, your heavenly Father knows your needs.

Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’

On that day of judgment many will say to me, 'Lord, Lord, we have preached the good news in your name.' And in thy name have we cast out devils, and do many signs.

Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nꞌugwu ahụ rịdata.

Many people followed Jesus when He came down from the mountain.

Nꞌezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro Eberaham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nꞌalaeze eluigwe,

In fact, many people from all over the world will come to associate with Abraham and Isaac and Jacob in the heavenly Kingdom,

ma ọtụtụ ndị si nꞌala Izirel, bụ ndị a na-akwadoro alaeze ahụ, ka a ga-atụba nꞌọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”

but many of the people of the land of Isles, who are supported by the kingdom, shall be cast into darkness, where there shall be weeping and gnashing of teeth. "

Nꞌoge anyasị, ha kpọtaara ya ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ nile, gwọọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ na-esogbu.

In the evening they brought to him the oppressed demons. He cast out all the demons and healed many who were suffering.

Mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe Jisọs mere, akpata oyi pụrụ ha nꞌahụ nꞌihi egwu. Ha toro Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ike dị otu a.

When many people see what Jesus did, they may be shocked. They praise God, who gives such power to humans.

Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌụlọ Matiu iri nri. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sooro Jisọs nọdụ na-eri nri.

Later, Jesus and his disciples have entered Matthew's home for a meal. Many others, even tax collectors and sinners, were reclining with Jesus.

Ya mere, unu echegbula onwe unu. Unu dị oke ọnụ ahịa nꞌanya Chineke karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ.

Therefore, do not worry. You are worth more to God than many birds.

Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọcha obodo nile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, nꞌihi na obodo ndị a echegharịghị bịakwute Chineke.

Then Jesus began to curse the cities where he performed many miracles, because these cities did not repent to God.

Ma Jisọs maara ihe ha na-ezube ime. Nꞌihi ya o sitere nꞌụlọ ekpere ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịrịa ha nile.

But Jesus knew what they were planning to do. So he left the chapel. But many people followed him. He healed their sicknesses.

O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịgha mkpụrụ nꞌubi ya.

He told them many things by parables. He told them, “A farmer went out to cultivate his fields.

Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-agwa unu sị, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe ndị a anya unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe ndị a ntị unu na-anụ, ma ha enweghị ike.

For I speak to you the truth, that many prophets and righteous men longed to see these things which ye now see, and to hear the things which are in your ears. meat, but they cannot.

Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nꞌebe ahụ, nꞌihi na ha enweghị okwukwe nꞌime ya.

Therefore, he did not perform many miracles there, because they did not have faith in him.

Ngwangwa akụkọ ọbịbịa ha gbasara ebe nile nꞌobodo ahụ. Ndị mmadụ bidoro ịgbagharị na-agwa ibe ha ka ha dute ndị ọrịa ha ka Jisọs gwọọ ha Ọtụtụ mmadụ kpọtara ndị ahụ na-esighị ike.

News of their arrival spreads throughout the city. People started running around asking each other to bring their patients to Jesus to cure Many people brought the infirm ones.

Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ọrịa, na ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Jisọs gwọkwara ha nile.

Great crowds came to him. They brought to him all the sick, the lame, the blind, the hand, the maimed, the dumb, and many others. And Jesus heals them all.

Related Words
Near-By Words