browsetext-to-speech

Want to know what "ufodu" means in Igbo? View the translations below.

ụ̀fọ́dụ́

Translates to
some 

determiner

Sentences

Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”

Some men soon brought him a man with a withered limb. When Jesus saw the faith in those who had brought him this man, he said to the sick man, "Take heart because I have forgiven your sins."

Ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulukwanụ Chineke.”

Some Jewish religious teachers there said to themselves, "This man blasphemes God."

Ma ụfọdụ nꞌime ndị Farisịi hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a, gwa Jisọs sị, “Lee ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme! Ha na-emebi iwu! Ha na-aghọ ọka nꞌụbọchị izuike!”

But some of the Pharisees who saw them do this, and said to Jesus, “Behold, your disciples are doing this! They are breaking the law! They are like corn on the Sabbath day! ”

Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ.

Likewise, if some demons in the kingdom of the devil are fighting against one another, this shows them the fall of the kingdom, for a terrible division has come into the kingdom.

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs okwu sị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ọrụ ebube ọzọ.”

Then some of the teachers of the law and the Pharisees spoke to Jesus, saying: “Teacher, we want to show you another miracle.”

Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nꞌime ha dara nꞌakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrụ ha loo.

While sowing the seeds, some of them fell along the path where the birds came and punched them.

Ma ụfọdụ nꞌime ha dara nꞌala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha pupụtara, too, nꞌihi na aja dị nꞌebe ahụ emighị emi.

But some of them fell on rocky ground. It didn't take long for them to grow up, because the sand there was shallow.

Mkpụrụ ụfọdụ danyere nꞌala ebe ogwu ogwu dị. Mgbe ha topụtara, ogwu ahụ kpagburu ha.

Some seeds stick to the bottom of the thorn. When they grow up, they are persecuted by the thorns.

Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nꞌezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị iri mkpụrụ atọ, ụfọdụ iri mkpụrụ isii, ụfọdụ kwa narị mkpụrụ.

But some seeds fell on the ground and bore fruit. Some bear thirty fruits, some sixty, and some a hundred.

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị Juu si Jerusalem bịara ịjụ Jisọs ajụjụ.

Then some Pharisees and Jews from Jerusalem came to question Jesus.

Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a ebere, nꞌihi na mụ na ha anọọla abalị atọ nꞌebe a, ma ha eribeghị nri ọ bụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nꞌihi na ụfọdụ ha nwere ike ịda nꞌụzọ.”

Jesus called his disciples and said to them, "I feel sorry for the people, because I have stayed with them for three days and they have not eaten anything. I will not send them malnourished, because some of them may be lost along the way. ”

Ha zara sị ya, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, ma ọ bụ otu nꞌime ndị amụma.”

They replied, "Some say that you are John the Baptist, some say that you are Elijah, and others that you are Jeremiah or one of the prophets."

Ụfọdụ nꞌime unu ndị guzo nꞌebe a ugbu a ga-adị ndụ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa dị ka eze nꞌalaeze ya.”

Some of you who are standing here now will see the Son of Man coming as a king of his kingdom. ”

Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?”

Some Pharisees came up to him to ask him the question, "Is it lawful for a man to put up with it and not look for me?"

Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.”

Some are born prematurely through their mother. There are others, who have chosen not to have children because of the kingdom of heaven. Anyone can put up with this. ”

“Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, nꞌihe dị ka elekere toolu ụtụtụ, o sitere nꞌebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro na-eche onye ga-akpọ ha ọrụ.

Some time later, at about noon, staff members walked from a bus stop and saw other people standing and waiting for their employer.

Ụfọdụ nꞌime igwe mmadụ ahụ nọ Jisọs nꞌihu, ndị ọzọ sokwa ya nꞌazụ. Ha nile nọkwa na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi! Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! Otuto nꞌebe kachasị ihe nile elu!”

Some of the crowd was before Jesus, others were behind him. And they were all crying out, and saying, Praise the Son of David! Blessed is the one who comes in the name of the Lord! Praise be to the Most High! ”

Ndị ọzọ tiri ndị ozi eze ahụ ihe, mee ha ihe ihere. Ụfọdụ gbukwara ndị ozi ahụ eze zitere.

Others beat the king's messengers with shame. Some of the king's emissaries were also executed.

Ha kpebiri iziga ụfọdụ mmadụ ndị si nꞌotu Herọd. Ndị a bịara jụọ ya ajụjụ a, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu. Ị na-ezikwa eziokwu, na-echeghị echiche ihe ọjọọ ga-adakwasị gị. Ị dịghị asọkwa onye ọ bụla anya, nꞌihi na ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu.

They decided to send some men from Herod's palace. These visitors asked him: “Teacher, we know that you are honest. And you tell the truth, without thinking about what will happen to you. You also do not show partiality to anyone, for you do not show partiality.

Nꞌụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nꞌọnwụ adịghị, bịakwutere Jisọs ịghụ ya ọnụ. Ha gwara ya sị, “Onye ozizi, Mosisi kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọ bụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Ụmụ ọ bụla nwanyị a mụtara site na di ọhụrụ ya ga-erite ihe nile nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwere.

And on that day some of the Sadducees, who say that there is no resurrection, came to Jesus to bury him. They told him, “Teacher, Moses said that if any man dies without having children, his brother will marry the widow. Every daughter born to her new husband will benefit from everything that the deceased man has.

Related Words
Near-By Words