browsetext-to-speech

Want to know what "so" means in Igbo? View the translations below.

-sò

Translates to
follow 

verb

to travel behind, go after, come after
"The ducklings followed their mother around the pond"
"Please follow the guide through the museum"
Sentences

Matiu, ọna ụtụ, bụ nwoke ahụ hapụrụ ọrụ ịna ụtụ ya soro Jisọs. Nꞌakwụkwọ nke ya o gosiri anyị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ụwa, onye ndị amụma Chineke gbara ama na ọ ga-abịa ọtụtụ afọ gara aga.

Matthew, a tax collector, was the man who left his tax duties to follow Jesus. In his book he shows us that Jesus is the Savior of the world, whom God's prophets warned would come many years ago.

Ha hapụrụ ngwa ọrụ ha otu mgbe ahụ soro ya.

They left their appliances at once and followed him.

Otu mgbe ahụ ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.

At the same time, they left the boat and their father and followed him.

Ọtụtụ mmadụ na-eso ya ebe nile ọ bụla ọ na-aga. Ndị sitere Galili, na Dekapolis, na Jerusalem, na Judia, na ọ bụladị nꞌofe osimiri Jọdan, bịara soro ya.

A lot of people follow him wherever he goes. People from Galilee, Decapolis, Jerusalem, Judea, and even across the Jordan followed him.

“Ụzọ dị warara na-eduba nꞌeluigwe. Site na ya baa. Ụzọ dị obosara na-eduba nꞌọkụ. Ọtụtụ mmadụ na-esoro ya nꞌihi na ọ dị mfe.

“The narrow way leads to heaven. From there it goes. The wide road leads to the fireplace. Lots of people follow him because it's easy.

Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nꞌugwu ahụ rịdata.

Many people followed Jesus when He came down from the mountain.

Otu onye ọzọ nꞌime ndị so ya na-agagharị gwara ya okwu sị ya, “Aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”

Another one of the traveling men spoke to him and said, "I will follow you, but allow me first to go and bury my father."

Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a, hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”

But Jesus answered him, "Follow me now, and let the dead in their spirits bury their dead."

Mgbe Jisọs hapụrụ ụlọ ebe o mere ka nwanta nwanyị ahụ site nꞌọnwụ bilie, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru isi sooro ya. Ha tikuru ya na-asị, “Nwa Devidi, meere anyị ebere!”

When Jesus left the house where he had raised the sister from the dead, two blind men followed him. They shouted to him, "Son of David, have mercy on us!"

Ha sooro Jisọs bata nꞌụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kweere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “Ee, Onyenwe anyị, anyị kweere.”

They followed Jesus into the house where he was. He asked them, “Do you believe that I can see you?” They answered, “Yes, Lord, we believe.”

Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike.

Follow my ways and learn from me. For I am mild-tempered and lowly in heart. You will find rest in your hearts.

Ma Jisọs maara ihe ha na-ezube ime. Nꞌihi ya o sitere nꞌụlọ ekpere ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịrịa ha nile.

But Jesus knew what they were planning to do. So he left the chapel. But many people followed him. He healed their sicknesses.

Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ.

Because these evil thoughts come from within the human heart: murder, adultery, chase, and sex, stealing, lying, and slander.

Ma Jisọs egheghị nwanyị ahụ ọnụ. Ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya rịọọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si esogharị anyị na-enye anyị nsogbu site nꞌarịrịọ ya!”

But Jesus did not kiss her. He was silent. After that the disciples came up to Jesus and asked him, “chase after this woman! How sorry he is to intercede with us in pleading for him! ”

Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buliekwa obe ya soro m nꞌazụ.

Then Jesus spoke to his disciples, saying: “If anyone wants to be my follower, let him disown himself first and pick up his cross after me.

Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha.

A large crowd followed him. He also healed the sick among them.

Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụsịrị Jeriko, igwe mmadụ sooro ya nꞌazụ.

After Jesus and his disciples left Jericho, a large crowd followed him.

Igwe mmadụ ahụ so Jisọs gbọchiri ha ọnụ, sị ha mechie ọnụ ha. Ma ndị ìsì ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, meere anyị ebere!”

The crowd followed Jesus and said good-bye to them. But the blind men persisted with loud cries, "Lord, have mercy on us!"

Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ha. O metụrụ ha aka nꞌanya. Ngwangwa ha malitere ịhụ ụzọ, bidokwa iso Jisọs.

Jesus had compassion for them. He touched them with love. Immediately, they began to follow Jesus.

Ọtụtụ nꞌime igwe mmadụ ahụ so Jisọs, tụsara uwe ha nꞌokporo ụzọ. Ndị ọzọ ghuturu alaka osisi, tụsaa ha nꞌụzọ, nꞌihu ya.

Most of the crowd followed Jesus, throwing their clothes on the road. Others cut down branches and threw them in front of him.

Related Words
-wédàbring down
-jégo, walk
-nátáreturn
-gáfèpass, cross
-chụ́pụ̀drive away, drive out
-nyàdrive
ónyéperson
Near-By Words